Nyere ndị gọọmentị steeti na okpuruọchịchị aka ịrụpụta ụlọọgwụ mbugharị iji hụ na onye niile bi n'ime kilomita atọ maọbụ ebe e ji ụkwụ aga nwereike inweta ọgwụgwọ.
Kwalite mmepụta ọgwụ dị icheicche na ọgwụ mgbchi na Naịjirịa.
Nchekwa
Mezie ma kwalite ụgwọọrụ ndị ọrụ nchekwa ma mepụta atụmatụ pụrụ iche maka inyere ezianaụlọ ndị agha meruru ahụ aka.
Kwalite ngwaagha, ngwaọrụ mgbasaozi na ngwa njem ndị agha.
Nye ọrụ, nye ọzụzụ ma kwalite ndị agha, ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ.
Kwụsị mwakpo ụlọọrụ gọọmentị kpam kpam.
Agụmakwụkwọ
Mepụta usoro nyocha ọhụrụ maka ikwalite ogo agụmakwụkwọ na nkuzi n'ụlọ agụmakwụkwọ dị icheiche malite na praịmarị ruo na mahadum.
Malite atụmatụ inye ụmụakwukwọ ego mbite.
Malite akpa ego maka agụmakwụkwọ nke ego gọọmetị etiti agaghị adaba n'ime ya.
Malite atụmatụ ga-ebute mmekọ na etiti anyị na ndị agbataobi anyị iji chekwa oke ala Naịjirịa dị na mpaghara Westị Afrịka nakwa nke etiti nakwa atụmadị na Nije, Chad na Kameruun.
Tinye ndị mmadụ n'ọrụ nchekwa gụnyere ndị agha, ndị uweojii na ọrụ nchekwa ndị ọọ ma zụọ, kwado ma tinye ego na ngalaba ahụ iji nyere ha aka ịrụ ọrụ ha ọsịsọ.
Agụmakwụkwọ
Tinye ego na ikwalite ọzụzụ maka akaọrụ, egwuregwu, azụmahịa, teknụzụ dị icheiche malite n'ụlọakwụkwọ praịmarị ruo na sekọndịrị.
Atụmatụ agụmakwụkwọ nke a kpọrọ "e nweghi nwata a ga-ahapụ"
Kwere ka ụlọọrụ ndị buru ibu jiri iịkwado ụlọakwụkwọ na-akwụ ụtụ isi ha ebe gọọmentị ga-enwe ụlọakwụkwọ ndị ahụ, na-ewepụta usoro agụmakwụkwọ ma na-ahazi ihe ndị ọzọ.
Were pasentị 14 ego dị na bọjetị tinye n'agụmakwụkwọ.
Mpụ
Rubere iwu gbasara mmefu ego isi.
Tinye ngalaba gọọmentị niile n'ime usoro nyocha kwamgbe kwamgbe
Kwụsi ebe niile ego si eripu na gọọmentị ma kwụsị ịkwụ ụgwọ mbelata ego mmanụ ụgbọala.
Kwụba aka ọtọ ma gosi ọha etu e si emefu ego gọọmentị.
New Nigeria People's Party
Isi sekpu ntị
Mepụa ọrụ site na itinye ego n'ọrụ ugbo
Kwụsị nsogbu nchekwa
Kwanyere iwu ugwu ma soro ụzọ dị siri werere
Akanaụba obodo
Buso mpụ agha na ngalaba gọọmentị niile ma bulite ebe e si enweta ego
Gbanwe usoro mkpata ego ma mee ka ọ bawanye ụba ma bụrụ ụzọ ga na-amụta ọtụtụ ego n'ọdịnihu.
Chuso usoro doro anya ma kwusie ike iji hazie ego a na-ere ego Bekee
Inye ọrụ
Belata enweghi ọrụ gaa otu dijit
Kwado ndị ntoroọbịa ka ha were ọru n'ọrụ ugbo
Kwado ndị nkịtị ka ha tinye ego na ihazigharị nri iji kepụta ọrụ
Ahụike
Gbanwee atụmatụ chekwa ahụike nke adịghị ama ama
Belata njem ofesi maka ahụike site na ịkwalite ụlọọgwụ, kwalite etu ndị ọtụ i eleta ndị ọrịa, ọzụzụ ndị ọrụ ahụike nakwa teknụzụ.
Welite ego a na-etinye n'ahụike na bọjetị
Nchekwa
Kwalite ngwaagha e ji eme nyocha achopụta nsogbu iji wulite ezi nchekwa
Gbasoo udo, mkpezi na idi na otu na Naịjirịa niile
Kwụba aka ọcha nye ndị ọha
Agụmakwụkwọ
Tinye ego zuru oke na ngalaba agụmakwụkwọ
Kwalite mahadum ndị dị ugbua tupe e kewapụta ndị ọhụrụ
Gbaa mbọ rụpụta ụlọ maka ụmụaka na-anaghị aga akwụkwọ ruru nde 20 na-akpagharị n'ogbe ugbua
Mpụ
Hazie ma kwalite ngalaba ndị na-ebuso mpụ agha
Chịa ọchịchị kwubara aka ọtọ ma gosi ọha ihe ha na-eme
Jiri teknụzụ gbochi mpụ
People's Democratic Party
Isi sekpu ntị
Nye ndị oji ego achụ ego ohere n'ime akụnaụba obodo
Chuso idi na otu site na nhọpụta gọọmentị ga-eme na mpaghara dị icheiche iji hụ na a gụnyere onye niile