Bola Tinubu: Akụkọ etu Onowu Naịjirịa si bụrụzie onye Eze n'onwe ya

Ihe ndị gbapụtara ihe na ndụ ndọrọndọrọ ọchịchị nke onyeisiala na-abata ọhụrụ

N'ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị, a kpọpụtara aha Bola Ahmed Tinubu dịka onye meriri ntuliaka ọkwa Onyeisiala Naịjirịa, nke so na ntuliaka a kacha zọọ azọọ kamgbe Naịjirịa lọghachiri n'ọchịchị ndị nkịtị n'afọ 1999.

Mmeri ya nwere ọtụtụ mgbagha, pati abụọ ndị ọzọ so zọọ ntuliaka ahụ agbaala akwụkwọ n'ụlọikpe iji gbaghaa mmeri ya. Mana ndị nkwado Tinubu na-ekwu na mmeri a bụ nchịkọta kwesịrị ekwesị maka afọ niile ọ nọrọla dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa.

Ụfọdụ ekwupụtala gbasara ọnọdụ ahụike Tinubu nakwa etu o si kpata ego ya, ha bokwara nwa amadị ahụ chịburu Legọs Steeti ebubo nrụrụaka, bụ nke ọ gọrọla na ọ bụghị eziokwu.

Maazị Tinubu ga-ewere ọchịchị n'oge ọnọdụ akụnụba ọjọọ nakwa nnukwu nkewa, mana ndị nkwado ya na-ekwu na ọ ga-eji ihe ọ mụtara oge ọ bụ gọvanọ were gbanwee ọnọdụ mba a dị n'Ọdịda Anyanwụ Afrịka.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2023

2023

Maazi Tinubu nwetara mmeri dịka o nwetara vootu 37% na ntuliaka ahụ e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị. Ọrụ chere ya n'ihu dịka Onyeisiala mba a kacha nwee ọnụọgụgụ mmadụ n'Afrịka karịrị akarị, nke gụnyere enweghị ezi nchekwa, mgbali elu ọnụ ahịa, nakwa enweghị ọrụ. Tinubu kwere nkwa ijikọta mba a ma wulitekwa ọnọdụ akụnụba ya ozọ.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2022 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2022 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2022

2022

Dịka ọtụtụ ọnwa gara ndị mmadụ ji ajụ ajụjụ ma ọ ga-azọ, Tinubu kwupụtara na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala. Achụmnta vootu ya jupụtara na mgbagwoju anya dị icheiche gbasara afọ ole ọ dị, ebubo nrụrụaka a na-ebo ya, nakwa onye ọ họpụtara dịka osote ya - onye ụka alakụba si mpaghara Ugwu - bụ nke ọtụtụ katọrọ maka na ọ dabaghị n'usoro e si emebu ya na mbụ.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2021 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2021 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2021

2021

Dapo Apara, onye ọrụ mgbakọ ego bụbu onyeisi ụlọọrụ Alpha-Beta, kpụpụrụ Tinubu ụlọikpe. Ụlọọrụ a na-elekọta etu ego si abata n'akpa gọọmentị Legọs Steeti. Apara boro Tinubu ebubo na o ji ụlọọrụ ahụ ebupu ego, ezu ohi, nakwa ezere ịkwụ ụtụisi. E boro ebubo na Tinubu nwere oke n'ụlọọrụ ahụ n'aha onye ọzọ. Ekpeziri okwu ahụ n'ụzọ na-abụghị nke ụlọikpe dịka otu afọ gachara.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2019

2019

N'ụbọchị na-eso ụbọchị ntuliaka, onyonyo ebe ụgbọala 'bullion van' na-abanye n'ime ụlọ Tinubu na Legọs fesara n'ịntanetị, nke mere ọtụtụ ji boo ya ebubo na soshal midia na ọ na-achọ ịzụ vootu. Onyeisiala Muhammadu Buhari mechara merie ọkwa Onyeisiala nke ugboro abụọ ya.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2015

2015

Onyeisiala Buhari meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala, nke wetara n'isi njedebe afọ 16 nke otu 'Peoples Democratic Party' nọrọ n'ọchịchị. Tinubu ji nke a nyaa isi n'afọ 2022 oge ya onwe ya kwuru na ya ga-azọ ọkwa ahụ.

Ọdụm nke Bourdillon', bụ onyonyo 'documentary' nke boro Tinubu ebubo nrụrụaka n'ọchịchị Legọs Steeti, pụtara site n'aka ụlọọrụ AIT. Tinubu gbara ụlọọrụ ahụ akwụkwọ n'ụlọikpe ma kwuo ka AIT kwụọ ya nde naịra 150 ($325,000) maka imetọ aha ya. Ha abụọ mechara kpezie n'ụzọ abụghị nke ụlọikpe.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2013

2013

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị anọ na-anọghị n'ọchịchị jikọrọ aka ọnụ iji kepụta 'All Progressives Congress (APC) ma napụ ndị PDP ọchịchị na ntuliaka nke afọ 2015. Mazị Tinubu so na ndị isi mkparịtaụka na nkwekọrịta a bụ nke kwadoro Ọchịagha Muhammadu Buhari ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala n'aha pati APC.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2011

2011

A kpụpụrụ Maazị Tinubu n'ụlọikpe 'Code of Conduct Tribunal' nke ugboro abụọ, mana e kwuru na aka ya dị ọcha.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2007 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2007 Bola Tinubu - Akụkọ ya 2007

2007

Ọchịchị Tinubu dịka Gọvanọ Legọs Steeti bịara n'isi njedebe, mana ọ bụrụzịrị onye a ma ama ka 'papa nnukwu', dịka ụfọdụ boro ya ebubo na o jisiri ego steeti ahụ ike, ma bụrụkwa onye na-ahọpụta ndị niile ga-achị steeti ahụ.

A kpụpụrụ Tinubu n'ụlọikpe 'Code of Conduct Tribunal' nke mbụ n'ihi ebubo na o nwere akara ọbaego na mba ọzọ oge ọ bụ gọvanọ, bụ nke iwu machiri. Mana ọ gọrọ na aka ya dị ọcha.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 2003

2003

Tinubu meriri ntuliaka nke abụọ ya dịka Gọvanọ Legọs Steeti. A na-ekwu na ọ bụ ya wulitere ọnọdụ akụnụba steeti ahụ site n'ịkpọbata ọtụtụ ụlọọrụ si mba ofesi. Ndị nkwado ya kwukwara na o wulitere okporoụzo na ọrụ ndị ọzọ na steeti ahụ. Mana ndị na-akatọ ya kwuru na ọrụ dị icheiche na steeti ahụ dakpọrọ, ọmụmaatụ ha nyere bụ ọrụ okporo ụgbọoloko 'light rail', bụ nke malitere n'oge ọchịchị Tinubu mana a rụchabeghị ya ihe karịrị afọ 20 kamgbe o bidoro.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1999 Bola Tinubu - Akụkọ ya 1999

1999

Naịjirịa lọghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Onyeisiala Olusegun Obasanjo meriri ntuliaka onyeisiala, ebe Mazi Tinubu meriri ntuliaka Gọvanọ Legọs Steeti na pati 'Alliance for Democracy'. Obasanjo chịburu Naịjirịa dịka onye agha malite n'ọnwa Febrụarị 1976 ruo 1979.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1998

1998

Ọchịchị afọ ise nke Ọchịagha Sani Abacha bịara n'isi njedebe dịka ọ nwụrụ n'ọnwa June. Mazi Tinubu lọtara ebe ọ gbagara ọsọ ndụ ka ọnwa olemole gachara.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1994

1994

Ọtụtụ ndị na-akwado ọchịchị onye kwuo uche ya, tinyere Mazi Tinubu gbara ọsọ ndụ gbapụ na Naịjrịa iji gbalahụ mmekpa ahụ n'aka ọchịagha Abacha.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1993 Bola Tinubu - Akụkọ ya 1993

1993

Naịjirịa banyere n'ọnọdụ nnukwu ọgbaaghara dịka Ọchịagha Ibrahim Babangida kagburu ntuliaka ọkwa onyeisiala nke afọ 1993 - bụ nke ọtụtụ hụtara na nrụrụaka ọbụla adịghị na ya. Ka ọchịchị nchereoge nọrọ nwa mgbe nta, ọchịagha Sani Abacha weghaara ọchịchị n'ike n'usoro nke ndị agha; ọchịchị ya jupụtara n'aka ike na nrụrụaka. Moshood Abiola - onye meriri ntuliaka ahụ - gara mkpọrọ.

Ngalaba ikpe ziri ezi nke mba Amerịka gbara akwụkwọ n'ụlọikpe na-ebo ebubo na ọbaego e ji aha Bola Tinubu mepee n'afọ 1988 nwere ego dị n'ime ya nke si n'ịgba mgbere ahịa ọgwụike a na-akpọ 'white heroin'. Ha boro ebubo na Tinubu na-arụrụ onye na-ere ọgwụike a, aha ya bụ Adegboyega Akande ọrụ. ụlọikpe kpebiri na o kwenyere na ego dị n'ọbaego ahụ si n'ịzụ ahịa ọgwụike, mana ha akpụpụghị Tinubu ụlọikpe, kama ha nwere nkwekọrịta na gọọmentị ga-anapụ ya ego dị $460,000.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1992

1992

Njem Tinubu dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị malitere dịka a họpụtara ya ka onye omeiwu ukwu ga-anọchite anya mpaghara 'Lagos West' n'otu Social Democratic Party. Oge ọ banyere n'ụlọ omeiwu Sineti, ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi kọmiti na-ahụ maka ụlọakụ, ego, atụmatụ mkpata na mmefu nakwa 'currency'.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1980s

1980s

Mazi Tinubu sị na ọ rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ mba Amerịka bụ Deloitte tupu ọ lọghachi Naịjirịa ebe ọ rụrụ ọrụ n'ụlọọrụ 'Mobil oil'.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1979 Bola Tinubu - Akụkọ ya 1979

1979

Dịka ọ dị ọtụtụ ihe banyere ndụ ya, agụmakwụkwọ Tinubu bụkwa ihe juputara na mgbagwoju anya dịka ọ malitere achụmnta vootu ya, mana mahadum steeti Chicago mechara kwuo na ọ gụrụ akwụkwọ n'ebe ahụ n'ezie ma nweta asambodo na ngalaba 'business administration' n'afọ 1979.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1970s

1970s

Akụkọ gbasara ndụ Tinubu na agụmakwụkwọ ya edoghị anya, mana ọtụtụ kwetara na ọ gafere mba Amerịka n'ebe etiti afọ 1970s.

Bola Tinubu - Akụkọ ya 1952

1952

Dịka akụkọ dị na websaịt achụmnta vootu ya, a mụrụ Bola Ahmed Tinubu n'ụbọchị 29 nke ọnwa Maachị afọ 1952, na Legọs, Naịjirịa. Ọtụtụ na-agbagha nke a dịka ha na-ekwu na afọ ya karịrị nke a.