Agbụrụ Ndọrọndọrọ Ọchịchị Saraki
Ọtụtụ ezinaụlọ nwere agba na Naijiria enyela Naijiria ndị ndu site na agbụrụ ruo na agbụrụ.Onyeisiụlọ ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki, onye bụ onye si na ezinaụlọ. Dịka e meriri ya na ntuliaka imeụlọ PDP mere anyị na-ele anya n'agbụrụ ndọrọndọrọ o si pụta.
Abubakar Olusola Saraki
(Mee 1933 - Nọvemba 2012)
Ọ bụ dọkịta bekee mana ọ mechara banye ndọrọndọrọ ọchịchị ma rụọ dịka onye senitọ ala Naijirịa na-agba ọchịchị onyekwuouche ya nke agba nke abụọ (1977-1983). O mechara bụrụ onyeisi ụlọomeiwu ukwu.
Ka o si gaa n'ije ndọrọndọrọ ọchịchị ya
-
1979A họpụtara ya dịka onye sinetọ na agba nke abụọ ọchịchị onyekwuoucheya na Naijiria
-
1983A họpụtakwara ya ọzọ n'ụlọomeiwu ukwu n'aha ndị NPN
-
2003Ọ kwadoro nwa ya nwoke bụ Bukola Saraki dịka onye zọrọ Ọkwa gọvanọ Kwara steeti

Abubakar Bukola Saraki
(Disemba 1962 rue ugbua)
Ọ bụ dibịa bekee. nwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị nwụrụ anwụ bụ Olusola Saraki
Ka o si gaa n'ije ndọrọndọrọ ọchịchị ya
-
2003A họpụtara ya dịka gọvanọ Kwara steeti
-
2007A họpụtakwara ya ọzọ dịka gọvanọ Kwara steeti
-
2011A họpụtara ya n'ụlọomeiwu ukwu inọchịte Kwara-Sentralụ n'aha PDP
-
2015A họpụtakwara ya ọzọ dịka sinetọ na-anọchite Kwara-Sentralụ n'aha PDP
-
Juun 9,2015Onyeisi ụlọomeiwu nke asatọ
-
Julai 31, 2018Ọ banyere otu pati People's Democratic Party (PDP)
-
Ọgọstụ 30,2018O kwupụtara ebumnobi ya ịzọ ọkwa onyeisiala
-
Ọktọba 6,2018Atiku Abukakar meriri ya iji nweta ikike ịzọ ọkwa onyeisiala n'aha PDP
Gbemisola Ruqayyah Saraki
(Mee 1965 rue ugbua
ọ bụ ọkachamara n'ihe gbasara akụnaụba. Ọ bụ nwanne Bukola Saraki nwaanyị nke obere na nwaa Sinetọ Olusola Saraki nwụrụ anwụ.
Ka o si gaa n'ije ndọrọndọrọ ọchịchị ya
-
1999A họpụtara ya ịnọchite mpaghara Asa/Ilorin West na Kwara steeti n'ụlọomeiwu nke nta
-
2003-2011Ọ bụ sinetọ na-anọchite Kwara Sentralụ n'ụlọ omeiwu ukwu n'aha otu People's Democratic Party (PDP)
-
2015Ọ kpụrụ afọ n'ala na mbọ i nweta ikike ịzọ ọkwa gọvanọ n'aha otu PDP
-
Apreelu 7,l 2015Ọ hapụrụ otu All Progressive Congress (APC)
-
2016Onyeisiala Buhari mere onyeisi mahadum, Federal University Otuoke, Baylesa
-
2018O kwupụtara nkwado ya nye Onyeisiala Buhari maka ntuliaka 2019
Ǹdị sere foto:
Getty, Facebook
Chee aka ghọrọ akụkọ ndị ọzọ na BBC Igbo