Bola Ahmed Tinubu
Bola Ahmed Tinubu rigoro n'ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa nke 16 n'ụbọchị Mee 29.
Ọ bụbu gọvanọ Lagos steetị 1999-2007.
Ọ rụkwara ọrụ dịka sinetọ nke Lagos, ma bụrụkwa onye na-edekọ ego.
Bola Ahmed Tinubu rigoro n'ọkwa dịka onyeisiala Naịjirịa nke 16 n'ụbọchị Mee 29.
Ọ bụbu gọvanọ Lagos steetị 1999-2007.
Ọ rụkwara ọrụ dịka sinetọ nke Lagos, ma bụrụkwa onye na-edekọ ego.
Kashim Shettima bụ Osote Onyeisiala Naịjirịa ugbua.
Ọ bụbu gọvanọ Borno steetị ma bụbu Sịnetọ.
Ọ rụkwara ọrụ na ngalaba ụlọakụ.
E nyela Mohammed Badaru ọkwa minista na-ahụ maka nchekwa
Ọ bụbu Gọvanọ Jigawa Steeti site 2015 ruo 2023.
Ọ bụ ya so na ndị nwe ụlọọrụ Talamiz Group of Industries, ebe a na-arụpụta akụrụngwa dị icheiche gbadoro ụkwụ igwe n'ụgbọ, igwe nrụpụta makwa ịzụ anụmanụ.
Maazị Abubakar gụrụ Ngụkọ na mahadum Ahmadu Bello, dị na Zaria.
E nyela Bello Matawalle ọkwa minista na-ahụ maka nchekwa.
Ọ bụbu Gọvanọ Zamfara Steeti chịrị otu ugboro.
Onye nwere ọzụzụ onyenkuzi, ọ bụrụkwala onye ụlọomeiwu nta.
E nyela Olawale Edun ọkwa Minista na-ahụ maka ego na akụna ụba mba Naịjirịa
Ọ bụ onye ndụmọdụ nye Onyeisiala Bola Tinubu gbasara atụmatụ ego
Ọ bụbu kọmịshọna gbasara ego nke Legọs Steeti.
Ọ rụbụrụ na World Bank na ngalaba atụmatụ ego na mba Karibean na mba Latin Amerika.
Ọ bụ onye so hibe ụlọakụ Stanbic IBTC.
E nyela Atiku Bagudu ọkwa minista Bọjet na atụmatụ ego
Ọ bụbu gọvanọ Kebbi Steeti site afọ 2015 ruo 2023 dịka Sinetọ.
Ọ bụ enyi aka chiburu Naịjirịa; Sani Abacha, bụrụkwa onye a tụrụ nga na Amerịka maka ebubo ego na-apụnara mmadụ ihe, ikpe o kpebiri kama mkpọlata bịa Naịjirịa.
A họpụtara Olubunmi Ojo dịka Mịnịsta na-ahụ maka ihe na-eme n'ụlọ
Ọ bụbu onye omeiwu n'Ụlọ Nnọchiteanya
O ji asambodo Masters na Digital Communications & Networking na London Metropolitan University
E nyela Tahir Mamman ọkwa Minista na-agụmakwụkwọ
Ọ bụ onyeisi nchịkọta Mahadum Baze, n'Abuja.
Ọ bụ ọkammụta nke iwu ma bụrụkwa onye okaiwu ukwu.
Ọ bụbụ onyeisi agụmakwụkwọ n'ụlọakwụkwọ ndị ọkaiwu, Nigerian Law School site 2005 ruo 2013.
E nyela Tanko Sununu ọkwa minista na-ahụ maka Agụmakwụkwọ.
Maazị Sununu bụ onye ụlọomeiwu si Kebbi.
Ọ bụ dọkịnta na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị na Federal Medical Centre dị na Birnin Kebbi ebe ọ rụrụ ọrụ kemgba afọ 2012.
E nyela Ali Pate ọkwa dịka Minista na-achịkọta Ahuike na Ọdịmma ọha.
Ọ bụ dọkịnta ma bụrụkwa ọkammụta n'ihe gbasara Ahụike ọha na mahadum 'Harvard University'.
Ọ rụrụ dịka Onyeisi Ahụike, ezi nri na ọgụgụ mmadụ ma bụrụkwa Onyeisi Ngalaba na-enye enyemaka ego maka ụmụnwaanyị, ụmụ ntoroọbịa nakwa ụmụaka na World Bank Group.
E nyela ọkwa Minista Tunji Alausa na-ahụ maka ahụike na ọdịmma ọha.
Ọ bụ onye hibere ma bụrụkwa onyeisi Kidney Care Center and Dialysis Care Center na Illinois, n'Amerịka.
Onye ma ihe gbasara nefroloji ma jiri ihe karịrị afọ iri atọ na-arụkwa na ya bụ Ahụike gbasara ọha.
E nyela Ibrahim Geidam ọkwa Minista gbasara ndị Uweojii.
Ọ bụbu Gọvanọ ugboro atọ nke Yobe Steeti ma bụrụ onye omeiwu Yobe Steeti nọ n'agba nke abụọ ya.
O ji asambodo n'agụmagụ gbasara mgbakọ na mwepụ ego, ma bụrụkwa onye otu Certified Public Accountants of Nigeria.
E nyela Imaan Suleiman Ibrahim ọkwa Minista nke steeti na-ahụ maka ndị Uweojii.
Ọ bụbụ Onyeisi na-ahụ ngalaba na-ebu agha megide mgbere mmadụ a kpọrọ 'National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons' tupu e mee ya kọmịshọna na ngalaba na-ahụ maka ọdịmma ndị gbara ọsọ ndụ nke a kpọrọ 'Federal Commissioner of the National Commission for Refugees, Migrants, and Internally Displaced Persons'.
E nyela Dave Umahi ọkwa Minista na-ahụ maka ọrụ.
Ọ bụ sinetọ Ebonyi steetị, ebe ọ rụkwara ọrụ dịka gọvanọ site 2015 ruo 2023
E nyela Ahmed Dangiwa ọkwa Minista na-ahụ maka ụlọ na mmepe obodo.
Ọ bụbụ onyeisi na-elekọta ụlọakụ 'Federal Mortgage Bank of Nigeria'. Ọ bụ onye nka ewumewu(architect).
E nyela Ahmed Tijani Gwarzo ọkwa Minista nta na-ahụ maka ebe obibi na mmepe obodo.
Ọ bụbụ Osote Gọvanọ Kano Steeti malite n'afọ 2007-2011
Tijani bụ onye nchọpụta n'ụlọmmụta Wits School of Govanace' na Saụt Afrika
O nwere nzere 'Bachelor of Science'(Tech)
E nyela Alkali Ahmed ọkwa Minista na-ahụ maka njem
Ọ rụrụ ọrụ dịka sịnetọ na Gombe steetị 2010 ruo 2023
O nwere nzere 'Bachelor of Science' n'okwu akụnụba
E nyela Betta Edu ọkwa Minista na-ahụ maka ihe gbasara ndị mmadụ na igbochi ịda ogbenye
Ọ bụ Onye ndụ Otu Ụmụnwaanyị APC na-etiti ma bụrụkwa dịbịa Bekee
O nwetara akara ugo mmụta 'Masters' nke Sayensị na Ahụ Ike nke Ọha n'obodo na-emepe emepe na 'London School of Hygiene & Tropical Medicine' na Dọkịnta nke Ahụ Ike nke Ọha na Texila American University
E nyela Waheed Adebayo Adelabu ọkwa dịka Minista Ọkụ
Ọ bụbu osote gọvanọ, arụmọrụ na Central Bank of Nigeria
Ọ zọburu ọkwa gọvanọ Oyo steetị n'afọ 2019 mana o merịghị. Ọ malitere ọrụ dịka onye mgbakọ ego n'ụlọọrụ 'PricewaterhouseCoopers'.
E nyela Abubakar Kyari ọrụ dịka Minista na-ahụ maka ọrụ ugbo na nchekwa nri
Ọ bụbu sịnetọ Borno steetị 2015-2022
Ọ nwe asambodo Masters na Business Administration na Webster University, St Louis Missouri, USA
E nyela Aliyu Sabi ọrụ dịka Minista steetị, Na-ahụ maka ọrụ ugbo na nchekwa nri
Ọ bụbu sịnetọ Niger steetị ugboro abụọ site 2015 ruo 2023
A họpụtara Joseph UStev dịka Mịnịsta na-ahụ maka mmiri na idewe gburugburu ọcha
O nwere nzere PhD n'ihe gbasara mmiri na gburugburu
Ọ rụrụ ọrụ dịka direktọ n'ụlọmmụta ' Centre for Entrepreneurship Development' na mahadum 'Federal University of Agriculture' Makurdi malite n'afọ 2013 rue afọ 2017.
Ọ rụburu ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka mmiri na gburugburu na Benue steeti.
A họpụtala Bello Muhammad Goronyo dịka Minista Nta na-ahụ maka mmiri na idebe gburugburu ọcha
Ọ bụbụ Kọmishọna mgbasaozi na Sokoto Steeti
A họpụtala Abubakara Momoh dịka Minista na-ahụ maka mmepe Niger-Delta
Ọ bụ onye injinia ma rụkwa ụgbọrọ abụọ dịka omeiwu n' Ụlọnnọchiteanya.
A họpụtara John Eno dịka Mịnista na-ahụ maka egwuregwu
Ọ rụụ ọrụ dịka senetọ na-anọchite Krọs Riva n'agbata afọ 2015 na afọ 2019.
Ọ rụkwara dịka onyeomeiwu n'Ụlọnnọchiteanya na ụlọomeiwu nke steeti
E nyela Adegboyega Oyetola ọrụ dịka Minista na-ahụ maka ahịa osimiri
Ọ bụbu gọvanọ Osun steetị 2018 ruo 2022
Ọ malitere ọrụ 'insurance' dịka ọ gụchara akwụkwọ na mahadum 'University of Lagos', ebe o nwetara nzere 'Bachelor of Science' n'afo 1978.
E nyela Bosun Tijani ọrụ Minista na-ahụ maka Nkwukọrịta, ihe ọhụrụ na akụnaụba ịntanetị
Ọ bụ onye isi oche na otu n'ime ndị hibere CcHub
A họpụtara Yusuf MiatamaTuggar dịka Minista na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ
Ọ bụbụ omeiwu n'Ụlọnnochịteanya malite afọ 2007 rue 2011
Ọ bụbụ Onye Nnọchiteanya Naijiria na mba Jamanị kemgbe afọ 2017.
A họpụtara Festus Keyamo dịka Mịnista na-ahụ maka njem ụgbọelu
Ọ rụburu ọrụ dịka Minista Nta na-ahụ maka ọrụ n'oge ọchịchị Buhari
Ọ bụ ọkaịwụ na onye na-akwado ikike dịịrị onye
A họpụtara Ishak Salako dịka Minista \nta na-ahụ maka Gburugburu
Ọ bụ dịbịa Bekee ma rụkwaa ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka ahụike n'Ogun steeti
Ọ rụkwara ọrụ dịka onye nchịkọta otu 'Ogun West Stakeholders Forum'.
A họpụtara Uche Nnaji Mịnịsta na-ahụ maka Mmepụta ihe ọhụrụ, Sayensi na Teknụzụ
Ọ bụ ojiegoachụego
A họpụtara Muhammad dịka Idris Mịnịsta na-ahụ maka Mgbasaozi
Ọ bụ ya na-ebipụta akwụkwọ akụkọ 'Blueprint' na Onyeisi ụlọọrụ mgbasaozi 'Blueprint TV'
O nwere nzere 'Masters Degree'.
A họpụtala Dọkịta Dorris Aniche Uzoka dịka Mịnịsta na-ahụ maka azụmahịa na itinye ego azụmahịa
Ọ bụ dọkịta rụrụ ọrụ n'ụlọakụ, rụkwa dịka Kọmishọna na-ahụ maka ego na nchịkọta akụnaụba n'Imo steeti.
A họpụtara Shuaibu Abubakar dịka Mịnịsta na-ahụ maka nkwalite mmepụta igwe
Ọ bụ direktọ n'ụlọakụ 'Stanbic IBTC Bank' .
O nwere nzere MBA nke mahadum 'University of Oxford' nzere "Bachelor’s na "Master’s na mahadum 'Leicester University' dị na mba Briten.
A họpụtara Dele Alake dịka Minista na-ahụ maka Ọnatarachi.
Ọ bụ Onye Ndụmọdụ Pụrụ Iche nke Onyeisiala Bola Tinubu n'ọrụ pụrụ Iche, mgbasaozi na nhazi usoro
Ọ rụrụ ọrụ dịka Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi nke Leegọs Steeti
Ọ bụ onye ntaakụkọ
A họpụtara Uba Maigari dịka Mịnịsta Nta na-ahụ maka nkwalite mmepụta igwe
Ọ bụbụ Osote Gọvanọ Taraba steeti. A chụrụ ya n'ike tupu Ntuliaka afọ 2003.
Ọ bụ ọkaịwụ
A họpụtara Heineken Lokpobiri dịka Mịnịsta Nta na-ahụ maka Mmanụ Agbịdị
Ọ rụụ ọrụ dịka Senetọ ugboro abụọ tupu Muhammadu Buhari họpụta ya dịka Minista Nta na-ahụ maka ọrụugbo n'afọ 2015.
Ọ bụ ọkaịwụ
A họpụtara Ekperipe Ekpo dịka Mịnịsta Nta na-ahụ maka Mmanụ Agbịdị (Gaasị)
Ọ bụ onye omeiwu n'Ụlọnnochiteanya malite n'afọ 2007-2011
A họpụtara Simon Bako dịka Mịnịsta na-ahụ maka Ọrụ
Ọ bụbụ Gọvanọ Platu steeti agba abụọ
A họpụtara ya dịka omeiwu n'Ụlọomeiwu Platu Steeti n'afọ 1998. Ọ bụbụ onyeisi Ụlọomeiwu ahụ n'afọ 2000.
Ọ bụkwa onyeisi otu achụmtavootu maka ọkwa onyeisiala nke Tinubu
E nyela Lola Ade-John ọrụ Minista na-ahụ maka njem nlegharị anya
Ọ bụ ọkacha mara n teknuzu na ikerịta ozi rụrụ n'ụlọakụ 'Accessbank','United Bank of Africa', 'Ecobank' nakwa ụlọọrụ 'Novateur Business Technology'.
Ọ gụrụ 'Compter Science' na mahadum 'University of Ibadan'.
A họpụtara Nkeiruka Onyejeocha dịka Mịnịsta Nta na-ahụ maka Ọrụ
Ọ bụbụ onye omeiwu Ụlọ Nnọchiteanya si Abịa steeti
Ọ bụ onyeisioche Okpuru ọchịchị Umunneochi n'Abia steeti
E nyela Lateef Fagbemi ọkwa Minista na-ahụ maka ikpe ziri ezi na Ọkaiwu Ukwu nke Naịjirịa
Ọ bụ nnukwu ọkaiwu (Senior Advocate of Nigeria) nwetara ikike ịmalite ọrụ dịka ọkaịwu n'afọ 1984.
E nyela Uju Kennedy-Ohanenye ọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị
Ọ bụ ojiegoachụego na-etinye anya n'ihe gbasara ala na ụlọ nakwa agụmakwụkwọ
E nyela Nyesom Wike ọkwa Minista na-ahụ maka Abuja.
Ọ bubụ Gọvanọ Rịvas Steeti malite 2015-2023 ma bụrụkwa onye ọkaiwu.
E nyela Mariga Mahmud ọkwa Minista Abuja.
Ọ bụbu kọmịshọna agụmagụ na Kano Steeti.
Ọ bụ onye otu ndị nwere asambodo site n'ụlọakwụkwọọ ahụike a kpọrọ National Postgraduate Medical College and the West African College of Physicians.
E nyela Hannatu Musawa ọkwa Minista Nka na Omenala na Akụnụba sị na Nka.
Ọ bụ onye ndụmọdụ banyere Omenala na Nka nye Onyeisiala Bola Tinubu.
Ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa nwatakwụkwọ na-agụ asambodo dọkịnta.
E nyela Zephaniah Jisalo ọkwa Minista na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche nakwa ọrụ gọọmenti dị icheiche.
A họpụtara ya ugboro abụọ dịka onye omeiwu n'Ụlọ Nnọchiteanya, ụgboro abụọ dịka Onyeisioche Okpuru Ọchịchị 'Abuja Municipal Area Council'.
O nwere asambodo 'Advanced Diploma' na 'Applied Psychology, Diploma n' Criminal Justice and Administration na mahadun 'University of Jos' Diploma na 'Public Relations' n'ụlọakwụkwọ 'Institute of Mass Communication and Technology'.