E nweela ihe ruru nkwatu ọchịchị otu narị na iri atọ ndị gara nke ọma n'ime mba Afrịka 36 kemgbe afọ 1952 oge Eze Farouk nke Ijipt bụụrụ Onyeisi ọchịchị mbụ a chụpụrụ n'Afrịka.
Afrịka ahụtala nkwatu ọchịchị asatọ gara nke ọma n'ime afọ atọ. Ọnọdụ nkwatu ọchịchị a na-esochi oge nkwatu ọchịchị ndịagha gbaturu ala n'ime afọ iri abụọ rute 2020, dịka ọ gbagochara n'ime afọ ndị 1970.
Ụfọdụ ndị ndu jichiri ọchịchị chịrị ọtụtụ afọ ebe anapụrụ ndị ọzọ ikikere ọchịchị ahụ n'ime ụbọchị ole na ole ha weghaara gọọmenti.
Iji maa atụ, Onyeisiala Ekwitorịa Ginii bụ Teodoro Obiang Nguema a nọrọla dịka Onyeisiala afọ 44 o werechara ọchịchị n'ike n'afọ 1979.
Ọ bụ onyendu Afrịka kachasị nọrọ n'ọkwa.
Iji maa atụ, Onyeisiala Ekwitorịa Ginii bụ Teodoro Obiang Nguema a nọrọla dịka Onyeisiala afọ 44 o werechara ọchịchị n'ike n'afọ 1979.
Ọ bụ onyendu Afrịka kachasị nọrọ n'ọkwa.
Ọtụtụ obodo ndị e nwere na mpaghara Sahel ahụtala nkwatu ọchịchị ndịagha. Nkwatu ọchịchị ndị mere na nso nso a na mpaghara ahụ a maara dịka mpaghara nkwatu ọchịchị mere na Nijie na Gabọn n'afọ 2023.
Ndị ọchịchị ndịagha jichikwara ọchịchị na Mali n'ime afọ 2020 na 2021 ebe nke Chad, Ginii na Sụdan mere n'afọ 2021. Bọkịna Faso hụtakwara nkwatu ọchịịchị abụọ n'afọ 2022. Mba niile ndị a ewezuga Sụdan bụcha ndị nọbu n'okpuruọchịchị Fransị.
Kemgbe 2000, ọkara atọ (19 n'ime 26) nke nkwatu ọchịchị ndị gara nke ọma n'Afrịka mechara na mba ndị nọbu n'okpuru ọchịchị Fransị. Nke a emeela ka ụfọdụ jụọ ajụjụ ma mmetụta Fransị ọ na-akụsasị Afrịka.
Ọnụọgụ nkwatu ọchịchị
0
2
4
6
8
Ọtụtụ mba n'Ọdịda anyanwụ na Etiti Afrịka enweela ọtụtụ nkwatu ọchịchị gara nke ọma. Ihe ruru ọkara mba 17 ndị opekatampe nkwatu ọchịchị anọ ha gara nke ọma dịcha n'Ọdịda anyanwụ Afrịka.
Bọkịna Faso enweela ọnụọgụ nkwatu ọchịchị kachasị gaa nke ọma n'Afrịka dịka ha mere ya ugboro asatọ ebe Sierra Leone na Yuganda na-esote site n'inweta asaa n'otu n'otu.
Ọ bụ naanị ọkara atọ na mba Afrịka tụmadị n'Ọwụwa Anyanwụ na Ndịda Afrịka bụ ndị na-ahụtabeghị nkwatu ọchịchị gara nke ọma.
N'afọ 34, Ibrahim Traoré bụ onyeisiala kachasị obere n'ụwa. Ọ malitere ịbụ onyeisiala nchereoge Bọkịna Faso n'isochi nkwatu ọchịchị ndịagha mere n'abalị 30 Septemba 2022 bụ nke wezugara onyeisiala nchereoge n'oge ahụ bụ Paul-Henri Sandaogo Damiba.
Ihe fọdụrụ obere ka o ruo pasenti 90 nke nkwatu ọchịchị ndị ahụ gara nke ọma bụ nke ndịagha mere ebe nke ndị omekoome na-esote ya bụ nke dị pasenti 4. Nkwatu ọchịchị ndị ọzọ e mere n'Afrịka gụnyere nke ndị ekweghị, ọchịchị ndị nkụchi, ndịagha isi ekweghị ọnwụ na nke ndị ọchịchị.
Ọtụtụ ndị ndu banyere n'ọchịchị site na nkwatu ọchịchị bụ ndị e mechara chụpụ maọbụ gbuo mgbe ụfọdụ.
N'afọ 1972, General Ignatius Kutu Archeampong nọọrọ n'isi nkwatu ọchịchị na-enweghị nkwafu ọbara e ji chụpụ Praịm Mịnịsta Gana ahọpụtara n'usoro ọchịchị onyekwuoucheya bụ Dr. Kofi Busia. Mgbe afọ isii gasịrị, ac hụpụrụ ya n'ọchịchị ma gbagbuo ya dịka ọ gasịrị otu afọ.
Jean-Baptiste Bagaza chụpụrụ onyeisiala Burundi bụ Michel Micombero n'afọ 1976 ma weghara ọchịchị. Ka afọ iri na otu gasịrị, a chụpụrụ ya nke mere ka ọ gbaa ọsọ ndụ.
Omar al-Bashir batara n'ọchịchị n'afọ 1989 dịka onye brigadier general nke ndịagha Sụdan, o duuru otu ndịagha kwatuo ọchịchị a họpụtara n'usoro onyekwuoucheya. Ọ gara n'ihu dịka onyeisi obodo Sụdan n'okpuru ọkwa dị iche iche malite na 1989 ruo 2019 bụ mgbe e ji nkwatu ọchịchị wezuga ya.
François Bozizé Yangouvonda weghaara ọchịchị n'afọ 2003 iji bụrụ onyeisiala nke isii nke Sentralụ Afrịkan Rịpọblik. E mechara chụpụ ya ka afọ iri gasịrị.
Idobe ya n'ezinaụlọ
Ijichi ikikere ọchịchị bụ njirimara ezinaụlọ dị iche iche n'ụfọdụ mba. Onyeisiala Ekwitorịa Ginii bụ Francisco Macías Nguema bụ onye nwa nwanne ya bụ Teodoro Obiang Nguema Mbasogo chụpụrụ na nkwatu ọchịchị tara isi mmadụ n'afọ 1979. Teodoro nọchiri anya ya. N'afọ 2024, ọ bụụrụ onyeisiala nke abụọ kachasị nọrọ n'oche ọchịchị nke na-abụghị ocheeze na mbaụwa.
Laurent Kabila chụpụrụ Onyeisiala Mobutu Sese Seko n'afọ 1997 iji bụrụ onyeisiala nke atọ na DR Kongo. Nwa ya nwoke gbara afọ 29 n'oge ahụ bụ Joseph Kabila nọchiri anya ya oge otu n'ime ndị nche ya gbagburu ya.
Research: Ruth Mulandi; Text and data analysis Dorothy Otieno; Design: Millicent Wachira; Development: David Ayoola and Boaz Ochieng; Editing: Damilola Ojetunde and Dorothy Otieno. Additional support: Olaniyi Adebimpe, George Wafula, Mayowa Alabi, Brian Otieno, Ashley Lime and Esther Ogola.
Getty Images na ọbaozi gọọmenti ndị Afrịka