Muhammadu Buhari
Otu APC ga-emezu atụmatụ dị n'iwu 'Universal Basic Education ' ọkachasị  nwoke na nwaanyị ịha nhatanha na praimarị na sekọndrị, dịka ha na ewulite agụmakwụkwọ; Ha na-ele anya itinye pasent 15 ego Bojetị n' agụmakwụkwọ, ma tinyekwa ego n'ọzụzụ ndị nkụzi.
Ntule

Iwu Naijiria dịka o siri gbasaa atụmatụ agụmakwụkwọ 'Universal Basic Education ' nke e wepụtara n'afọ 1999 kwuru ka gọọmentị na-enye agụmakwụkọ afọ isii na Praimarị n'efu.Ụmụakwụkwọ n'owe ha ga-etinye afọ atọ na Sekọndrị nke nta nke gọmentị agaghị akwụ ụgwọ ya.

O nweghị ebe e kwuru na nwoke na nwaanyịụ ga-aha nhatanha mana ugbua  na Najiria ụmụnwoke ka ụmụnwaanyị na-aga akwụkwọ- Maka ụmụnwaanyị itoolu ọbụla  nọ n'ụlọakwkwọ , e nwere ụmụnwoke iri.

A na-eti mkpu maka ụmụnwaanyị idebanye aha maka agụmakwụkwọ.

Otu mbaụwa UN na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Unesco naekwu na ọ kacha mma ma ụmụnwaanyị 98 na 102 ọbụla nọrọ nọ n'ụlọakwkwọ  ebe e nwere ụmụnwoke nari.

Dika ngụkọ  'National Education Indicators' nke afọ 2016 siri  kwuo, ihe erughị otu n'ime steeti atọ  nwere nhatanha nwoke na nwaanyị dịka o si kwesị n'ụlọakwụkwọ Praimarị. Na sekọndrị nke nta, nke a gbaturu rue steeti itoolu, na sekọndrị ukwu ọ gbadara rue naanị steeti atọ.

Ekiti steeti kachasị eme ọfụma  dịka ha nwetarala nhatanha nwoke na nwaanyị

Katsina bụ steeti kachasị kpụọ afọ n'ala dịka o siri gbasa nhatanha  nwoke na nwaanyị n'ụlọakwụkwọ. Ụmụnwoke ji ihe karịrị 170,000 karịa ụmụnwaanyị nọ na Praimarị, ihe karịị 43,000 karịa ụmụnwaanyị na sekọndrị nke nta, ihe ruru 44,5000 karịa ụmụnwaanyị na sekọndrị ukwu

Mana, a tule na ngụkọ pasent ole ụmụakwụkwọ aha ha dị n'akwụkwọ, Zamfara steeti bụ steeti kacha njọ.  N'ogogo  agụmakwụkwọ niile,ụmụakwụkwọ ụmụnwoke nọ n'ụlọakwụkwọ dị maji abụọ ụmụnwaanyị.

Ezumoke agụmakwụkwọ ụmụakwụkwọ ndị a bụkwa ihe dị oke mkpa. Dịka nchọpụta nke 'Nigerian Education Data Survey' (NEDS), nke afọ 2015,naanị ụmụakwụkwọ pasent  44%  nọ n'ụlọakwụkwọ gọọmentị mara agụ ihe, ebe ụmụakwụkwọ pasent 74 nọ n'ụlọakwụkwọ nke ndị nọrọ onwe ha mara agụ ihe. Na sekọndrị nke nta, ọnụọgụgụ a gbalitere rue pasent 91 nakwa 96 .

Onyeisiala Buhari aṅụọla iyi na ya ga-etinye pasent 15 bọjetị n'agụmakwụkwọ. Mana ihe o merela kemgbe ọ banyere ọchịchị gosiri na o mezubeghị dịka o kwuru.

N'afọ 2016, ọchịchị ya tinyere pasent asatọ bọjeti na agụmakwụkwọ. in 2017 this amount fell to 7.4%. N'afọ 2018, ego ahụ gbadatar rue pasent 7.4. N'afọ 2018, pasent gara n'ihu gbadatarue pasent asaa, nke bụ naanị ijeri naira 650($1.8bn, £1.4bn).

Iji gbalie mezuo ihe o kwuru, onyeisiala kwesiri itinye mmaji ego ọ na-etinye rue otu tarri naira na ụma(N1.3 trillion)

Atiku Abubakar
Anyị na-etinye otu tarịị naira ($2.8bn,#2.2bn) n'ịgwụ ụgwọ ọnwa ndị agha na ndị ọrụ nchekwa mana ihe erughị ọkara ego ka ha na-akwụ ndị ọrụ nkụzi
... Abali 12 nke ọnwa Ọgọstụ (Mkparịtaụka ya naakwụkwọ ntakụkọ ThisDay)
Ntule

N'afọ 2018, gọọmenti Naijiria mapụtara ijeri naira 650 maka agụmakwụkwọ, nke ụzọ abụọ n'ime ụzọ atọ(Ijeri naira N407.8) bụ maka ịkwụ ụgwọ ọnwa.

Mana ego ole a na-etinye na ịkwụ ụgwọ ọnwa fọọ nwa ihe ka ya na-ego a mapụtara maaka nchekwa, ebe naanị ijeri naira 12. na -aga n'ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị agha.

N'otu afọ ahụ, gọọmentị chọọ itinye ijeri naira N418 na nchekwa nke foro obere ka ya na ego ụgwọ ọnwa ndị nkuzi hara nhatanha.

A bịa n' ego ole ga-abanye na ịkwụ ndị agha ụgwọ ọnwa, am mapụtara ijeri 12.2 naira.

A gbakọcha ego niile a na nke ana-akwụ ndị sokwa n'ọrụ nchekwa( ijeri naira 164), o pekarịrị ọkara ihe gọmenti na-emefu n'ịịkwụ ndị nkuzi ụgwọ. O nweghị ka o siri rute otu tarri Atiku kwuru a na-emefu.

Ma ụgwọ ọnwa ọ na-erute ndị o kwesiri ka ọ bụ na ọ naghị erute ha bụ akụkọ ọzọ.

Dịka nyocha ụgwọ ọnwa nke otu BudgiT mere siri ggosi, opekatampe steeti 12 n'ime 35 akwụbeghị ndị nkụzi ụgwọ e ji ha.

Mmekọrịta Pịa ebe

Ntule