Kedụ ihe ndị mere n'afọ 2018 ị ka chetara?

Lee nwa ule anyị a ka ị mara

Answers are below

Question 1/12

Otu n'ime ihe ndị a esoghị ọkpụrụkpụ okwu Obasanjo gwara onyeisiala Muhammadu Buhari n'akwụkwọ ozi o degara

1. Oke agụụ na ụbịam
2. Enweghị nchekwa/nsogbu ndị ọchịehi
3. Ịkpa oke agbụrụ
4. Ihe adịla mma



Question 2/12

Gịnị ka Uche Kanu, nwunye onye ndu Ipob bụ Kanu kwuru maka ebe di ya bụ Nnamdi Kanu nọ na mkparịtaụka ya na BBC nwere

1. Gọọmentị etiti ma ebe dị m nọ.
2. Ama m ebe di m nọ
3. Di m nọ n'okeosimiri Bayelsa
4. Di m nọ n'Israel



Question 3/12

Kedụ okwu a kpụ n'ọnụ oge Naomi Campbell bịara Naịjirịa n'ọnwa Maachị, afọ 2018?

1. Ntọ ụmụaka Dapchi
2. Ndị Fulanị na-achị ehi
3. Ogbugbu ndị Boko Haram gburu ndị agha mmadụ 11
4. Egwu Eke



Question 4/12

Ego ole ka Miracle Igbokwe, nwa afọ meriri na Big Brother Naija nke 2018 ritere?

1. Nde naira 35
2. Nde naira 45
3. Nde naira 25
4. Nde Naira 50



Question 5/12

Kedụ ọgwu ike ndị ntaakụkọ BBC nyochapụtara ndị ntorobịa Naijiria na-aṅụzi ka manya nke n'ụfọdụ ha na-enwezi isi mgbaka?

1. Tramadọl
2. Codeine
3. Paracetamọl
4. Aspịrịn



Question 6/12

Kedụ aha anụmanụ buru amụma na Naijiria ga-eru agba anọ nke ikpeazu n'iko mbaụwa?

1. Ezi a kpọrọ Octopus
2. Ezi a kpọrọ Marcus
3. Ezi a kpọrọ Michael
4. Ezi a kpọrọ Paul



Question 7/12

Kedụ onye otiegwu a ma ama nwa ya dakpuru mmiri nwụọ n'afọ 2018?

1. Wizkid
2. Davido
3. Dbanj
4. Tiwa Savage



Question 8/12

Kedụ steeti ụlọakwụkwọ ụmụaka ise turu ugo ọkaibe n'asompi technụzụ a kpọrọ Tecnovation?

1. Abịa
2. Anambara
3. Ebonyi
4. Enugwu



Question 9/12

Kedụ onye ihe nkiri Nollywood a ma ma gara APC ịzọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti maka ntuliaka 2019 mana ụkwụ kpọọ ya tupu ọsọ ebido?

1. Kenneth Okonkwo
2. Kanayo Kanayo
3. Yul Edochie
4. Emeka Ike



Question 10/12

Kedụ onye nchịkọta Super Eagle a dara nha $5000 maka ịna aka azụ $1000

1. Stephen Keshi
2. Sunday Olise
3. Salisu Yusuf
4. Austin Eguavoen



Question 11/12

Kedụ egwu Paul Okoye, otu n'ime ejima Psquare tiri n'afọ wuru ewu mere ndị mmadụ na-eche na egwu ahụ metụtara esemokwu dị n'etiti ya na ejima ya?

1. Chioma
2. Chiemela
3. Chizoba
4. Chidubem



Question 12/12

Kedụ okwu Fada Mbaka gwara Peter Obi mere soshal midia jiri nwuru ọkụ n'ọnwa Disemba?

1. Chegharịa
2. Abụ m nwa ọgbụgba ndụ
3. Kpọpụta ego ịga enye anyị
4. I gaghị emeri na ntuliaka 2019



Answers

1. Otu n'ime ihe ndị a esoghị ọkpụrụkpụ okwu Obasanjo gwara onyeisiala Muhammadu Buhari n'akwụkwọ ozi o degara

Answer: Ihe adịla mma

N'ọnwa Januwarị afọ 2018,Olusegun Ọbasanjo degara onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ ozi ebe o tiri mkpu maka ụbịam, nsogbu nchekwa na ndị ọchịehi, ịkpa oke agbụrụ nakwa akụnaụba ịkpụ afọ n'ala na-arị elu.


2. Gịnị ka Uche Kanu, nwunye onye ndu Ipob bụ Kanu kwuru maka ebe di ya bụ Nnamdi Kanu nọ na mkparịtaụka ya na BBC nwere

Answer: Gọọmentị etiti ma ebe dị m nọ.

Nnamdi Kanu bu onyeisi Ipob bụ onye a na-achọbu achọ kemgbe Sepụtemba afọ 2017 tupu ọ pụta ọzọ na nso nso a. Mana na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, nwunye ya bụ Uche Kanu na gọọmenti Naịjirịa maara ebe di ya nọ


3. Kedụ okwu a kpụ n'ọnụ oge Naomi Campbell bịara Naịjirịa n'ọnwa Maachị, afọ 2018?

Answer: Ogbugbu ndị Boko Haram gburu ndị agha mmadụ 11

Ụmụ Naijiria zisara Naomi Campbell na Muhammadu Buhari iwe na soshal midia dịka foto ha abụọ ebe ha na-achị eze gbara n'elu internet ụbọchị ndị agha mmadụ iri ndi otu Boko-Haram gburu ka dọ n'ozu.


4. Ego ole ka Miracle Igbokwe, nwa afọ meriri na Big Brother Naija nke 2018 ritere?

Answer: Nde naira 25

Nwafọ Igbo a kpọrọ Miracle Igbokwe meriri na Big Brother Naija nke atọ e mere ebe o ritere Nde naira 25


5. Kedụ ọgwu ike ndị ntaakụkọ BBC nyochapụtara ndị ntorobịa Naijiria na-aṅụzi ka manya nke n'ụfọdụ ha na-enwezi isi mgbaka?

Answer: Codeine

Nyocha ndị ntaakụkọ BBC mere gosiri na ụfọdụ ụlọọrụ na-emepụta ọgwụ ụkwara Codeine na-ere ya n'ụzọ megidere iwu nke mere na ọ na abanye n'aka ndị ntorobịa.


6. Kedụ aha anụmanụ buru amụma na Naijiria ga-eru agba anọ nke ikpeazu n'iko mbaụwa?

Answer:



7. Kedụ onye otiegwu a ma ama nwa ya dakpuru mmiri nwụọ n'afọ 2018?

Answer: Dbanj

Nwa DBanj dakpuru na mmiri dị n'ụlọ ha na Legọs


8. Kedụ steeti ụlọakwụkwọ ụmụaka ise turu ugo ọkaibe n'asompi technụzụ a kpọrọ Tecnovation?

Answer: Anambara

Ụmụakwụkwọ ise ụlọakwụkwọ Regina Pacis, Ọnicha, Anambara steeti mere asọmpi teknụzụ a kpọrọ ‘World Technovation Challenge' nke e mere na mba Amerịka.


9. Kedụ onye ihe nkiri Nollywood a ma ma gara APC ịzọ ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti maka ntuliaka 2019 mana ụkwụ kpọọ ya tupu ọsọ ebido?

Answer: Kenneth Okonkwo

Kenneth Okonkwo bụ onye a ma ama n'ihe nkiri Nollywood chọburu ịba na ndọrọndọrọ ọchịchị mana ụkwụ kpọrọ ya nke na ọ sonyeghị zọọ ntuliaka imeụlọ nke APC n'Enugwu steeti


10. Kedụ onye nchịkọta Super Eagle a dara nha $5000 maka ịna aka azụ $1000

Answer: Salisu Yusuf

BBC wepụtara ihe nkiri otu onye ntaakụkọ Ghana bụ Anas Arameyaw Anas, sere na nzuzo gosiri ka Yusuf na-ana 'onyinye' puku dọla ($1000), iji hụ na ọ kpọrọla ụfọdụ ndị ọgba bọọlụ gaa asọmpi mpaghara Afrịka nke 2017.


11. Kedụ egwu Paul Okoye, otu n'ime ejima Psquare tiri n'afọ wuru ewu mere ndị mmadụ na-eche na egwu ahụ metụtara esemokwu dị n'etiti ya na ejima ya?

Answer: Chizoba

Paul Okoye, otu n'ime ejima Psquare tiri egwu ọ kpọrọ ‘Chizoba' ebe ọ na-ekwu ka udo chịa. Egwu ahụ mere ndị mmadụ na-eche na ọ bụ nwanne ya nwoke bụ Peter, onye ya na ya kewarala, ka ọ na-agwa.


12. Kedụ okwu Fada Mbaka gwara Peter Obi mere soshal midia jiri nwuru ọkụ n'ọnwa Disemba?

Answer: Kpọpụta ego ịga enye anyị

Fada Mbaka, ụkọchụkwụ Katọlik gwara Peter Obi, ọnye so Atiku Abubakar azọ ọkwa onyeisiala dịka osote ya, ka ọ kpọpụta n'ihu ọha ego ole ọ ga-eji kwado mmemme ire ihe owuwe ihe ubi mịnịstrị ya.


  • JAN
  • FEB
  • MAR
  • APR
  • MAY
  • JUN
  • JUL
  • AUG
  • SEP
  • OCT
  • NOV
  • DEC

Kedụ ihe ndị mere n'afọ 2018 ị ka chetara?

Lee nwa ule anyị a ka ị mara

Ihe i nwetara:
I nwetara