Gbadata ka ị gaa n'ihu
Ebe a bụ ogbe naara ewu ewu na Buriticupu, obodo dị na mpaghara north-east nke Brazil.
Ugbua o miela nke ukwuu ruo 80m - ụlọelu nwere okpukpo 20 ga-abanwu ya n'ime.
Olulu mmiri dị etu a ka a maara dịka "mbuze" maọbụ "ala dọkara adọka" n'olu asụsụ Tupi-Guarani.
Ọnọdụ ahụ bụ n'ihi mbuzeala, otu n'ime mbibi ala kachasị njọ nke mmiri ozuzo na mmiri ruru unyi na-ebute.
Ọ na-amụba ọsọ ọsọ n'ụzọ na-amapụ obi, na-ebibi ọtụtụ ụlọ na Latin Amerịka na Afrịka.
Ebe a bụ ogbe naara ewu ewu na Buriticupu, obodo dị na mpaghara north-east nke Brazil.
Ugbua o miela nke ukwuu ruo 80m - ụlọelu nwere okpukpo 20 ga-abanwu ya n'ime.
Olulu mmiri dị etu a ka a maara dịka "mbuze" maọbụ "ala dọkara adọka" n'olu asụsụ Tupi-Guarani.
Ọnọdụ ahụ bụ n'ihi mbuzeala, otu n'ime mbibi ala kachasị njọ nke mmiri ozuzo na mmiri ruru unyi na-ebute.
Ọ na-amụba ọsọ ọsọ n'ụzọ na-amapụ obi, na-ebibi ọtụtụ ụlọ na Latin Amerịka na Afrịka.
Ọ fọrọ naanị obere ihe ka onye bụbu onye uweojii bụ José Ribamar Silveira nwụọ n'oge ọ danyere n'ime olulu a.
O furu ụzọ n'oge ji ụgbọala ya na-ala ụlọ ka ọ gachara mmemme abalị n'ọnwa Mee 2023.
Dịka ọ nyagharịrị ụgbọala ya, nwoke ahụ gbara afọ 79 gbugharịrị ma laa azụ. Chi ejiela, enweghị ihe ịdọ aka na ntị maọbụ ihe mgbochi gburugburu olulu ahụ, tupu ya a mara ihe ọ na-eme, ụgbọala ahụ nke ọ nọ n'ime ya adanyela na nnukwu olulu ahụ.
"N'oge ụgbọala ahụ chịpụrụ, ọ bụ eziokwu na ọ na-adanye ọsọọsọ, ihe m na-eche bụ maka nwa m nwoke nke obere," ya ka ọ gwara BBC.
Baby Gael gbara ọnwa anọ n'ụbọchị bọrọ ụbọchị ahụ. "A rịọrọ m Chineke ka o chekwaa m ka m nwee ike zụlite obere nwa m," ka Lt Silveira kwuru.
Ọ maghịkwa ebe ọ nọ n'oge ọ danyere dịka o tetara n'ala ala olulu ahụ ka awa atọ gasịrị. Dịka anapụtachara ya n'usoro na-agaghị nke ọma nakwa dịka ọnwa ole na ole gasịrị ọ nọ n'elu akwa, o nwere ike ịga ije ugbua na-ejighị igwe 'crutches'
Ihe ọ gabigara bụ ọmụmaatụ ihe ize ndụ mmadụ 70,000 bi na Buriticupu na-agabiga.
Ka olulu ndị ọzọ a na-apụta, a na-atụ egwu na steetị Maranhão, nke dị n’oke ọhịa Amazon, nwere ike kewaa ụzọ abụọ. Buriticupu dị mịta 350 n'elu oke osimiri, nwere ihe dị ka olulu 30 , nke abụọ kachasị ukwuu kewara ihe n’erughị otu kịlomịta.
Ọkammụta mbaraala na prọfesọ mahadum etiti nke Maranhọọ́ Edilea Dutra Pereira, kwuru si ''Ọ bụrụ n'ndi ọchichị enwghị ihe ha mere, ha ga-ezukọ wee mee oke osimiri.
Olulu abụrụla akụkụ ihe mere n’ụwa kemgbe ọtụtụ nde afọ.
Mana Prọfesọ Pereira na ndị ọkachamara ndị ọzọ anyị gwara okwu kwuru na olulu ndị dị adị na-agbasa ngwa ngwa ebe enwere egwu na ndị ọhụrụ ga-emeghe n'ihi mgbanwe ihu igwe, nke nwere ike ịbute nnukwu mmiri ozuzo.
Na’obodo na-eto eto na-enweghị ezigbo atụmatụ na akụrụngwa iji gbochie mmiri ozuzo, ihe ize ndụ na-abawanye.
Mba Brazil bụ obodo kachasị nwe mmetụta na Latin Amekịca, mana Mexico, Colombia, Ecuador na Argentina na-enwekwa nsogbu ahụ. N’uwa niile gbagburgburu, mba ndị dị na Afrịka, dịka Angola, Democratic Republic of Congo na Naịjirịa - ebe ụfọdụ olulu karịrị kilomita abụọ - na-emetụtakwa.
Udịrị olulu a bụ nke na-emebị ala ọrụugbo n'mba chaịna, Amerịka na Yurop
Enweghị ọnụọgụgụ maka ọnwụ sitere n’olulu, mana ndị ọchịchị n’Buriticupu na-ekwu na olulu emebiela opekata mpe ụlọ 50 ebe ụfọdụ ndị bi ebe ahụ agbahapụla ụlọ ha na ndị agbata obi ha
Ụlọ Marisa Cardoso Freire nọ n’nsọtụ olulu nke ndị nchekwa obodo kọwara dịka "oke ihe egwu" na n’onwa Mee afo 2023.
Ya na ezinulo 100 ndị ọzọ, hapụrụ ụlọ ha gaa n'akụkụ ọzọ n’Buriticupu.
Ụlọ Nzukọ Obodo kwere nkwa na ha ga-akwụ ụgwọ ụlọ ọhụrụ maka ndị a chụpụrụ n'ebe obibi ha, mana Marisa kwuru na obodo ahụ akwụghị ụgwọ ụlọ n'oge ebe eyiri ya egwu na a ga-achụpụ ya.
Mgbe anyị kpọtụrụ Ụlọ Nzukọ Obodo Buriticupu ka anyị jụọ ihe na-eme, ha azaghị.
N'ụlọ ochie Marisa, nkịta abụọ ezinụlọ ahụ dabara n'ime ọdọ mmiri wee nwụọ.
Otu ụbọchị, ọ nọ na-agbalị ime ka nwa ya nwoke dị afọ 10, bụ́ Enzo, bụ́ onye na-arịa ọrịa autism, ka ọ bịaghachi n'ụlọ, o weliri olu ya elu.
Enzo were iwe wee gbaga na nsọtụ olulu mmiri ahụ, o yiri ya egwu si "Ọ bụrụ na ị tie mkpu ọzọ, m ga-atụba onwe m n'ime olulu a"
"Ọ bụ mgbe ahụ ka m gwara di m na anyị apụghị ịnọ ebe a ọzọ,"
Ọ gaghị enwe ike ibi n'ụlọ ọ rụrụ
"Mgbe m hapụrụ, obi gbawara m n'ihi na ọ bụ ihe anyị tara afụfụ iji nweta."
Ịgbutu osisi na-nwere aka n’ụdị mmebi ala a.
Buriticupu bụ ebe kpọrọ nkụ nwere ọtụtụ okwute nke dị n’akụkụ oke ọhịa Amazon bụ nke osịsị dịka cedar kpuchiri “Ahụhụ na ipe n’mpaghara ọdịda anyanwụ india
N'afọ 1990s, ụlọ ọrụ osisi na-eme ọfụma ebe a. E nwere ihe karịrị ígwè ọrụ ịwa osisi 50 na-arụ ọrụ awa 24 kwa ụbọchị. Ka afọ iri abụọ gasịrị, ọtụtụ ahịhịa ndụ dị n'obodo ahụ adịghịzị.
"Okwu banyere ahịhịa ndụ dị mkpa, n'ihi na n'oge mmiri ozuzo, ọ na-ebelata mmetụta nke mmiri ozuzo."
Mgbe a na-enweghị osisi ma ọ bụ osisi zuru oke iji mịkọ mmiri ozuzo…
Ntụsa ndị ahụ na-ebupụ irighiri aja na mmiri na-anakọta n'elu.
Iyi na-etolite ma na-eyi ala.
Enwere ike ịmepụta ọwa mmiri ma ọ bụ olulu
Mgbe a na-enweghị osisi ma ọ bụ osisi zuru oke iji mịkọ mmiri ozuzo…
Ntụsa ndị ahụ na-ebupụ irighiri aja na mmiri na-anakọta n'elu.
Iyi na-etolite ma na-eyi ala.
Enwere ike ịmepụta ọwa mmiri ma ọ bụ olulu
Mgbanwe ihu igwe nwere ike ime ka usoro a dịkwuo njọ n'ebe ndị nwere ike ịkpata mbuze mmiri n'ihi na ọ nwere ike ibute oke mmiri ozuzo.
Juarez Mota Pinheiro, ọkà mmụta ihu igwe na Mahadum etiti nke Maranhão kwuru na Buriticupu na-enwe oke mmiri ozuzo karịa ka ọ dị n’mbụ.
N'ime ọnwa mbụ nke afọ 2023, steeti Maranhão nwere otu n'ime idei mmiri kachasị njọ n'akụkọ ya. Ihe karịrị ime obodo 60 abanyela n'ọnọdụ mberede, ọtụtụ puku mmadụ enweghị ebe obibi, ebe ọtụtụ nwụrụ.
Matthias Vanmaercke sitere na Mahadum KU Leuven dị n’Belgium kwuru na "A na-ebu amụma na oke mmiri ozuzo ga-abawanye ihe dịka pasnet 10 ruo pasent 15 [n'ụwa niile na njedebe nke narị afọ]. Nke ahụ nwere ike ọ gaghị adị nnukwu, mana ọ bụrụ na enwe oke mmiri ozuzo, a ga-enwe n’ihe mbuze.”
Ya na onye ọrụ ibe ya bụ Jean Poesen nyochara data sitere na ihe karịrị olulu 700 n’uwa niile gbagburugburu, wee kwubie na ọ bụrụ na oke mmiri ozuzo na-abawanye, ọ nwere ike ịbute mbuze mmiri.
Prọfesọ Vanmaercke na "Ọ ga-esi ike ịchọta ezigbo ọkà mmụta sayensị nke na-agaghị ekweta na mgbanwe ihu igwe ga-eme ka nke a ka njọ."
Ihe omume a na-emetụta ndị mmadụ n’ụwa, gụnyere nde mmadụ n'Afrịka.
Isi obodo Democratic Republic of Congo, Kinshasa nwere ọtụtụ narị olulu n’ebe mepere emepe - otu n'ime ha dị kịlomịta 2 n’ogologo. Enwere ihe karịrị kịlomịta 165 nke ogbunigwe n'obodo ahụ nwere nde mmadụ iri na abụọ
N'ime otu abalị nnukwu mmiri zoro n’Kinshasa n’afọ Disemba 2022, mmadụ 60 nwụrụ mgbe ụlọ ha dara na ndagwurugwu.
Alexandre Kadada nọ ebe ahụ.
O kwuru na "O mere n'ime n’ime nkejị 30 ma ọ bụ 40. Olulu malitere imeghe wee mee ka ụlọ niile fuo. A pụghị ịmata mpaghara ahụ, "
“Akụ m, ụlọ m, ihe niile alaa la. Naanị ụmụ m na nwunye m ka m zọpụtara.”
Onye agbata obi Mazị Kadada na ụmụ ya anọ so na ndị ihe ahụ metụtara. Di nwanyị ahụ nwere nkwarụ.
Ụmụ Mazị Kadada na-atụ ụjọ ugbu a n'ihi ntakịrị ihu igwe ọjọọ.
O kwuru na “Ọ bụ mmiri ozuzo na-emebi ihe niile. Mmiri ahụ wetara ọnwụ na obi nkoropụ.”
Prọfesọ Vanmaercke kwuru na, "Anyị na-ewere ya dị ka ihe egwu ọhụrụ nke Anthropocene. Anthropocene bụ ihe ndị ọkàmmụta sayensị na-eji akọwa mgbe ọrụ ndị mmadụ na-emetuta ụwa nke ukwuu.
Dịka ụlọ akụ mba ụwa si kwuo, “A na-atụ anya na ọnụọgụgụ ndị Kinshasa ga-eru nde 20 site n’afọ 2030 yana nde 35 n’afọ 2050 bụrụ nnukwu obodo mepere emepe na mba Afrịka
Mmụba obodo a na-achịkwaghị achịkwa nwere ike ịgụnye igbutu osisi - ihe mgbochi mbuze - yana ọrụ iwu na-akwadoghị nke mpaghara na-akụsighiike.
N'Buriticupu, ndị mmadụ na-atụ egwu mmiri ozuzo.
João Batista, onye dị afọ 52 na-arụzi ụgbọala n’akụkụ nnukwu olulu mmiri kwuru na, “E nwere mgbe ala ka ụlọ dara. Ọ na-eme mkpọtụ na-eme ihe ike, mee ka ihe niile maa jijiji. Mgbe ahụ ndị mmadụ na-ebe akwa. Ọ na-akpata nnukwu mwute.”
Ọ sịrị na “Ihe dị ka pasent 40 nke ndị ahịa m efuolarịgo m. Ọtụtụ ndị na-atụ egwu i bịa.” Ma ọ jụrụ ịpụ.
O kwuru na voçoroca dị n'azụ ebe ọ na-arụ ụgbọala bụbu ebe egwuregwu ụmụaka, mana olulu mmiri loro ihe niile dị ebe ahụ.
O kpebiri ịkụ achara iji mee ka mbuze ahụ kwụsịlata. Mana n'ihi oke nsogbu ahụ, Buriticupu chọrọ ogwụgwọ dị ukwuu.
Prọfesọ Vanmaercke kwuru na agbanyeghị, ezi ọrụ ịnjịiarịn na ego, nwere ike ikwụsi ihe a niile
Prọfesọ Poesen kọwara na iji kwụsị mbuze mmiri, obodo kwesiri ịrụ Ihe ịgbapu mmiri kwesịrị ekwesị iji chịkwaa mmiri ozuzo nke ga-ewepụ mmiri n'ebe ndị nwere ike ịze eze.
Onye ọkaiwu nke steeti Maranhão na-akpụpu obodo Briticupu ụlọikpe maka na Briticupu emeghi ihe ha kwetara aka ya.
Aka na-achị Briticupu bụ João Teixeira da Silva ekwughi ihe ọbụla banyee nsogbu ahụ kpọmkwem mana o kwuru na ya arịọla enyemaka n'aka gọọmentị etiti inye ha ego ha ga-eji kwaara mmiri ozuzo ahụ ụzo.
Gọọmentị etiti gwara anyị na ha na-ele anya mara ka ha gaoewepụta ego ruru nde 300rịls nke Brazil ($60n: £47) maka Buriticupu. Ha kwukwara na ha ewepụtala ego ruru 629,000rils ($12,000: £100,000) iji rụọ akwa mmiri na ọgba maka iweghachi ụzọ dị n'ime obodo ma kwatuo ụlọ ruru 89.
Mịnịstrị na-ahụ maka gburugburu kwuru na ha ga-ewepụta atụmatụ ha kporo "resilient systems in cities", mana o nweghi ihe ọ na-eme ugbua na Buriticupu.
"Ọrụ ndị a tara akpụ ma na-eri oke ego", dịka mayo siri kwuo. "Ihe anyị chọrọ bụ ka ndị ọchịchị dị icheiche ma n'okpuru ọchịchị, steeti na gọọmentị etiti tinye ya uche,"
Mana João Batista ma na ọ bụrụ na mbuze dị n'azụ ụlọọrụ ya na-abawanye, ị mara na ọ ga-apụ ebe ahụ.
Nke a bụ ọnatarachi na-agwa anyị na ọ bụrụ na anyị eletaghi planetị anyị anya, ọ ga-ebibi. Mmiri gaa n'ihu na-ezo etu a, ị mara na anyị nọ n'aka Chukwu maka na o nweghi ihe anyị ga-emeli.
Mana João Batista ma na ọ bụrụ na mbuze dị n'azụ ụlọọrụ ya na-abawanye, ị mara na ọ ga-apụ ebe ahụ.
Onye ntaakụkọ: Shin Suzuki
Ndị ntaakụkọ mgbakwunye:Stephanie Hegarty na Emery Makumeno
Ndị nnyocha: Tamara Gill, Carol Olona na Alison Gee
Onye nhazi: Caroline Souza
Ọdịdị 3D: Daniel Arce
Mwulite: Matthew Taylor, Marta Marti na Simon Frampton
Onye nlekọta ihe omume: Holly Frampton na Carol Olona
Onye nchịkọta ọrụ: Paul Ivan Harris
Onye sere foto: Vitor Serrano, Dareck Tuba na Alex Huguet/AFP site na Getty Images
Ndị ọzọ webatara ozi: Antonio Guerra, Universidade Federal do Rio de Janeiro; Fernando Bezerra, Universidade Estadual do Maranhão; Gilberto Salviano Almeida Filho and Claudio Luiz Ridente Gomes, Instituto de Pesquisas Tecnológicas; Marco Antônio Gomes and Helena Filizola, Embrapa; Ryan Anderson, University of South Africa. Global map: Vanmaercke, M., Chen, Y., De Geeter, S., Poesen, J., Campforts, B., Borrelli, P., and Panagos, P.: Data-driven prediction of gully densities and erosion risk at the global scale, EGU General Assembly 2022, Vienna, Austria, 23–27 May 2022, EGU22-2921 Borrelli, P., Alewell, C., Yang, J. E., Bezak, N., Chen, Y., Fenta, A. A., Fendrich, A.N., Gupta, S., Matthews, F., Modugno, S., Haregeweyn, N., Robinson, D.A., Tan, F. Vanmaercke M., Verstraeten, G., Vieira, D.C.S., Panagos, P. (2023). Towards a better understanding of pathways of multiple co-occurring erosion processes on global cropland. International Soil and Water Conservation Research, 11(4), 713-725.